Ela, eze Izrel

8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.

9Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke. 10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.

11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile. 12Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu. 13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.

14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?