Ọgwụgwụ ọchịchị Jehoshafat
31Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 32O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 33Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.
34Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.
35Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ. 36Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba. 37Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.
1Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel. 3Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.


