Joash edozie ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị

1Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba. 2Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ. 3Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.

4Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ. 5Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.

6Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”

7Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.

8Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 9A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara Onyenwe anyị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ. 10Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ. 11Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu. 12Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ Onyenwe anyị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ.

13Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa. 14Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.

15Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ. 16E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.