Abụ Miriam na ndị inyom

20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu. 21Miriam bụrụ abụ sị ha,

“Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ,

nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu.

Ịnyịnya na ndị na-agba ha,

ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”