Onyinye maka owuwu ụlọ nzute

1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.

3“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha:

“ọlaọcha, ọlaedo na bronz.

4Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha,

na nke ajị ewu;

5akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri,

na osisi akashia;

6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ,

ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;

7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.

8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha. 9Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.