Bezalel na Oholiab
30Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda. 31O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche. 32Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 33ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche. 34Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe. 35O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”
1Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
2Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ. 3Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile. 4Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ, 5bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
6Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ. 7Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.


