Igbe Ọgbụgba ndụ
1Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 2O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 3Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya. 4O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo. 5O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
6Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa. 7Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. 8A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu. 9Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.


