Agbụrụ Mosis na Erọn
13Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
14Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile.
Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ,
Hanok na Palu, Hezrọn na Kami.
Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
15Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ,
Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan).
Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
16Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha:
Geshọn, Kohat na Merari.
Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
17Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha,
bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
18Ụmụ ndị ikom Kohat bụ,
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
19Ụmụ ndị ikom Merari bụ
Mahali na Mushi.
Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
20Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom.
Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21Ụmụ ndị ikom Izha bụ
Kora, Nefeg na Zikri.
22Ụmụ ndị ikom Uziel bụ,
Mishael, Elzafan na Sitri.
23Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
24Ụmụ ndị ikom Kora bụ,
Asịa, Elkena na Abiasaf.
Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
25Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz.
Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
26Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.” 27Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.


