Ihe mmụta site nʼosisi fiig
32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. 33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. 34Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga. 35Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.


