Ọnwụ Jisọs
45Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
47Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.”
48Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.”
50Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume.
51Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha.
54Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
55Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi. 56Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi.


