Ikpe ọmụma megide ndị iro Izrel
1Okwu Amụma.
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,
na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,
nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile
na ebo niile nke Izrel dị.
2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
tụkọba ọlaọcha dịka aja,
na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.
Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,
ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.
Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
ka ndị iro ghara ịbata na ya.
Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,
nʼihi na anọ m na nche ugbu a.


