13“Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn,
nʼihi na aga m enye gị mpi igwe.
Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz,
ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba.
Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị.
Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”


