Select a Verse

Onyenwe anyị ga-elekọta Juda

1Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ,

nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri.

Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo,

na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.

2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ,

ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha,

ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha,

okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye.

Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ

a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.

3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ,

aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ;

nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile

ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda,

ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.

4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,

a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu,

a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha,

sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.

5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha,

ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile.

Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha,

ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.

6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,

zọpụtakwa ụlọ Josef.

Aga m eme ka ha lọghachita,

nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.

Ha ga-adị

ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,

nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,

aga m azakwa arịrịọ ha.

7Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha,

ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya.

Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ,

ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

8Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku,

chịkọtaa ha.

Nʼezie, aga m agbapụta ha,

ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.

9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche,

ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya.

Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ;

ha ga-alọtakwa.

10Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha,

sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha.

Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn.

Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.

11Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee.

A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ.

Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa.

A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa,

wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.

12Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị,

ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.